AKANKA NGƏGƏ AKWA ỌNWỤ NA NSỤKA IGBO NKE SI N’AKA
DOI:
https://doi.org/10.5281/zenodo.18333759Keywords:
Ngəgə, Ọnwụ, Abụ na, akanaka, Cry, elegy, death, song, style and work.Abstract
Nchọcha a lebara anya n’akanka ngəgə akwa ọnwụ na Nsụka Igbo. Mbunuche ndị nchọcha a kpọm kwem bụ inyocha akanka ngəgə akwa ọnwụ we wepụta nka asụsụ niile dị na ya ma kọwa etu ha si emetuta mmụọ mmadụ. Ọ bụ agụmagụ ọnụ ka e mere nchọcha a. Atụtụ ntụcha njatule a gbadoro ụkwụ na ya we mee nchọcha bụ atụtụ akanka. Ọ bụ site na ngere ntị ajụjụ ọnụ na nhụrụ n’anya ka ndị nchọcha siri nweta njatule e jiri mee nchọcha a. A chọpụtara na ngəgə akwa ọnwụ jụpụtara n’ọtụtụ nkaasụsụ nke gụnyere ajụjụ nzaara onwe, njaike, mbụrụ, myiri, ilu, kwunkwugha, kwunkwukwa, egbe okwu, mgbatị ụdaume na mgbochiume na ihe ndị ọzọ e ji eme ka asụsụ dị mma. Ndị nchọcha chọpụtakwara na ngəgə akwa nwere ọtụtụ ọrụ ọ na-arụ dị ka ime ka ndị mmadụ chemie echiche ime gbasara ọnwụ na onye nwụrụ anwụ, ya na ime ka ndị achọbụghị ibe akwa maka onye nwụrụ anwụ bebe akwa. Nchọcha a ga-akpalite mmụọ ndị Igbo n’ilebanya n’ihe gbasara akwa na ngəgə akwa. Ọ ga-esokwa n’ọrụ nchọcha e nwere na ngalaba agụmagụ ọnụ na omenala Igbo. Ndị nchọcha kpokuru ma onye elu ma onye ala ka ha mata na ngəgə akwa abụghị ajọ ihe kama ka ha mata na o nwere ọrụ na ụrụ dị iche iche ọ baara na ndụ mmadụ.
This research work examines the stylistic features of elegy as it concerns death in Nsukka area. The main objectives of the study are to analyse elegy from Nsukka area and bring out all the elocutionary in the elegy and explain how the elegy affects the human emotion. The study hinges on oral literature. The data was accumulated from listening, oral interview and observation. The theory used for data analyses is stylistic theory. The study reveals that death elegy is replete with numerous stylistics features such as rhetoric questions, exclamation, metaphor, simile, proverb, parallelism, repetition, vowel lengthening, consonants lengthening and other figurative words. The researchers also observed that Igbo death elegy has some emotional tempestuous that make people around to cry compulsorily. This research will sensitize the Igbo people to look at cry and elegy critically and find out other things therein. It will also contribute to the study of language and literature. The researchers thereby call on all and sundry to understand that elegy is not bad rather it has a lot of functions and benefits in the life of people.
Downloads
Downloads
Published
Issue
Section
License
Copyright (c) 2023 Language Review: International Journal of Linguistics

This work is licensed under a Creative Commons Attribution 4.0 International License.











